igbo catholic community (icc) new york, at angela merici ... · at angela merici parish, bronx, new...
TRANSCRIPT
IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC)
NEW YORK,
AT ANGELA MERICI PARISH,
BRONX, NEW YORK.
SUNDAY BULLETIN: 14TH SUNDAY IN
ORDINARY TIME (YEAR A)
SUNDAY, JULY 05, 2020 HYMNS:
ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU
OFFERTORY: TOBENNA/ONYINYE OMA
CONSECRATION: EZI CHUKWU NARA AJA
COMMUNION: BIAKWUTE M UNU NDI IBU N’ANYI
POST COMMUNION:O SACRAMENT MOST HOLY
DISMISSAL: EKENE DIRI GI, CHUKWU
IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo Onye Amuma Zekaraya 9:9-10
Isi Okwu: Lee, eze gi ji umeala na-abiakwute gi
Gi bu ada Zayon, were obi gi nile nuria nnukwu onu. Gi bu ada Jerusalem, tie
mkpu onu. N’ihi na lee, Eze gi na-abiakwute gi. O bu Onye Nzoputa aka Ya kwu
oto. O di nwayoo, biakwa na-agba inyinya ibu. O nokwasara n’elu nwa inyinya ibu.
O ga-ebipu ugbo ala nke Ifrem na inyinya agha nile nke Jerusalem. O ga-agbajikwa
uta agha biakwa gwa mba nile okwu udo. Ogbo ochichi ya ga-esite n’oke osimiri
ruo n’oke osimiri nke ozo biakwa site n’osimiri, ruo na nsotu nile nke uwa.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu
ABUOMA NA AZIZA YA
Aziza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gi ruo mgbe ebighi ebi
1. Chineke m na Eze m, aga m eto Gi. Aga m agozi aha Gi ebighi ebi. Aga m eto
Gi kwa ubochi, kwa ubochi. Aga m eto aha Gi ebighi ebi, ebighi ebi. Aziza
2. Onyenweanyi bu onye amara na onye ebere. O naghi ewe iwe oku. Obi oma
Ya ebuka. O na-emere ihe nile O kere ebere. Aziza
3. Onyenweanyi, ka ihe dum I kere kelee Gi. Ka ndi kwere na Gi too Gi. Ha koo
akuko ebube nke alaeze Gi. Ha kwuo okwu banyere iei ike Gi. Aziza
4. Onyenweanyi kwesiri ntukwasa obi n’okwu Ya nile. Onyenweanyi na-ekulite
ndi nile huru ehuru. Aziza.
IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Pol di aso degaara ndi Rome. 8: 9,
11-13
Isi Okwu: Unu ga-ebi ndu ka unu were Mmuo Nso kpagbuo mmehie nke anu ahu
Ihe unu choro abughi ihe nke anu ahu, kama ihe nke mmuo, ebe o bu na Mmuo
Chineke bi ebi n’ime unu. N’ezie, o buru na unu enweghi Mmuo nke Kristi, unu
abughi ndi nke Ya. O buru na Mmuo nke Onye ahu kulitere Jesu n’onwu, bi ebi
n’ime unu; o putara na Onye ahu kulitere Jesu n’onwu, ga-esite na Mmuo Ya,
were ndu nye ahu unu puru inwu anwu. Umunna m, n’ihi ya, o nweghi mkpa o
bula o di irubere onwe anyi nke bu anu ahu isi, ma o bu ibi ndu nke anu ahu. O
buru na unu biwe ndu di otu ahu, unu ga-ala n’iyi. Ma o buru na unu were Mmuo
Nso pigbuo mmeru nke anu ahu, unu ga-adikwa ndu.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ALELUYA
Aleluya, aleluya!! Onyenweanyi kwuru si: “Abu M uzo, ezi okwu na ndu. O nweghi
onye o bula na-abiakwute Nna M, e wepu ma o sitere n’Aka M. Aleluya!!!
OZIOMA di aso nke Matiu dere 11: 25-30
Isi Okwu: Adi M nwayoo dikwa umeala n’obi
N’oge ahu, Jesu kwuru si: “Nna!, Onyenwe eluigwe na uwa! Ana M ekele Gi, n’ihi
na, ihe a I zonahiri ndi oke mmuta na oke aghugho, ka I kpugherela umuntakiri
na-amaghi ihe! Nna! E, o bu otu o si masi Gi, ka I si mee ya! Nna M were ihe nile
nyefee M n’aka. O nweghi onye ma onye Nwa bu, ma o bughi so Nna; otu o si
buru, na o nweghi onye ma onye Nna bu, ma o bughi so Nwa, ma o bu onye o
bula o soro Nwa igosi Ya. Biakwutenu M, unu nile bu ndi na-adogbu onwe unu
n’oru, ndi e bokwara ibu di aro, aga M enye unu ezumike. Nyaranu ibu M n’ubu
unu. Mutakwanu ihe site n’aka M, maka na adi M nwayoo, dikwa umeala n’obi.
Mmuo unu ga-achota ezumike. N’ezie, ibu M di nfe. Ibu M adighi aro.
Ozioma nke Oseburuwa.
Otito diri Gi, Kristi.
14TH SUNDAY REFLECTION
DIVINE INVITATION TO HIS PROVIDENTIAL CARE
Every invitation extended to us asks that we come along and join the party or the people and be with them wherever they are. The invitation could be to come and
join in the people's joy, happiness, celebration, feasts or to help or share in the person's sufferings or situation.There could be other reasons why invitations are
extended to us. However, this invitation given to us by the Lord speaks out strongly the reason for it and it is primarily asking us to run to Him for refuge and
succor. He is inviting us to help, care, cushion, lift, provide and attend to our distressful needs. He is simply saying that we cannot do it on our own, that He
feels our situations and is ever ready to help us and quench our thirst. The Psalmist says: "Cast your burden upon the Lord and He will sustain you. He will never allow the righteous to be shaken" (Ps 55 :22) We have found out that all our struggles are in vain without the lord. We must have to invite the lord and make him part of our plans and programs. "Commit your works tot he Lord. Ad
your plans will be established". Proverbs 16:3. St Peter is of the opinion that we have to unload all our worries upon the lord and he will take care of us. (1Pet 5: 7). We who are burdened, distressed, sickened, stricken, depressed, anguished, broken, shattered, displaced etc can come to the lord to be healed, restored,
energized, restated, rested and established. Bear in mind that "Providence has its appointed hour for everything. We cannot command results. We can only strive ."
Mahatma Gandhi
Happy Sunday!!
Produced by ICC Choir