igbo catholic community (icc) of new york,€¦ · igbo catholic community (icc) of new york, at...
TRANSCRIPT
IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF
NEW YORK,
AT ANGELA MERICI PARISH,
BRONX, NEW YORK.
SUNDAY BULLETIN: 8TH SUNDAY IN
ORDINARY TIME (YEAR A)
SUNDAY, FEBRUARY 26, 2017
HYMNS:
ENTRANCE: OTITO NILE DIRI ONYENWEANYI
OFFERTORY: NARA CHINEKE NARA/OKAKA IMEKA
CONSECRATION: ANYI ARIO GI CHINEKE NNA
COMMUNION: AGA M EJE N’ALTAR
POST COMMUNION: MY GOD I WILL PRAISE YOU
DISMISSAL: WE PRAISE YOUR NAME
IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo Onye Amuma Aizaya 49:14-15
Isi Okwu: Enweghi m ike ichefu gi.
Zayon kwuru si: “Onyenweanyi ajula m. Onyenwe m echefuela m.” Nne, o nwere ike ichefu nwa ya na-
anu ara? O nwere ike ighara ilekwa nwa o siri n’afo ya muputa? A sigodu nan ne nwere ike ichefu nwa,
enweghi M ike ichefu gi.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ABUOMA NA AZIZA YA 61: 2-3, 6-9, Az. 9
Aziza: So na Chineke ka mkpuruobi m na-ezuru ike
1. So na Chineke ka mkpuru obi m na-ezuru ike. Nzoputa m si n’aka Ya abia. So Ya bu nkume m,
nzoputa m, na ulo okwute m. Onweghi ihe o bula ga-elupu m obi. Aziza
2. Mkpuru obi m zuru ike soso na Chineke. N’ihi na nchekwube m si n’aka Ya abia. So Ya bu nkume
m, nzoputa m, na ulo okwute m. O nweghi ihe obula ga-elupu m obi. Aziza.
3. Nchedo m na ebube m di n’aka Chineke. O bu okwute na-enye m ike. Na Chineke ka m na-
agbaga oso ndu. Ndi nke m! Tukwasinu Ya obi mgbe dum. Wepuchaanu ihe nile no unu n’obi
n’ihu Ya. Aziza.
IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Ozi Mbu Pol di aso degaara ndi Korint. 4:
1-5
Isi Okwu: Echiche nzuzu mmadu bu n’obi ka Onyenweanyi ga-agba n’anwu.
Ndi mmadu kwesiri ihu anyi dika umu odibo Kristi, na dika ndi e kenyere oru ilekota ezi na ulo n’ihe
omimi nke Chineke. Ihe mbu a choro n’aka odibo na-elekota ezi na ulo bu ka nna ya ukwu hu ya dika
onye kwesiri ntukwasi obi. O nweghi ihe m ji ya kporo ma o buru na unu, ma o bu ulo ikpe o bula
mmadu guzobere, achoputa na m kwesiri ekwesi ma o bu na m ekwesighi ekwesi. Agaghi m ekpe onwe
m ikpe o bula ma oli. O bu ezie na ako na uche m anaghi ata m uta o bula ma oli, ma nke ahu egosighi
na aka m di ocha. Onye new ikpe m ikpe bu so Onyenweanyi. Onye ebikwala ikpe mgbe oge ahu na-
erubeghi. Hapunu nke ahu ka o diwa mgbe Onyenweanyi ga-abia. O bu Ya ga-agba ihe dum ezoro
n’ochichiri a’anwu. O ga-ekpughe izu nzuzo nile di n’obi mmadu. Mgbe ahu ka onye o bula ga-anata
otito kwesiri ya n’aka Chineke.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ALELUYA
Aleluya, aleluya! Onyenweanyi, okwu Gi bu mmuo na ndu. O bu Gi ji okwu ndu ebighi ebi. Aleluya!!!
OZIOMA di aso nke Matiu dere 6:24-34
Isi Okwu: E chegbula onwe gi maka echi
Jesu gwara Umuazu Ya si: “O dighi onye puru ibu odibo nna ukwu abuo n’otu mgbe. N’ihi na o ga-akpo
otu asi, hu nke ozo n’anya. Ma o bu, na o ga-asopuru otu, lelia nke ozo. Ya mere unu enweghi ike ibu
odibo Chineke na odibo aku na uba. “N’ihi nke a ka M ji asi: unu echegbula onwe unu banyere ndu unu
na ihe unu ga-eri. Unu echegbula onwe unu banyere ahu unu na uwe unu ga-eyi n’ahu. O bu na o bughi
ndu kariri ihe oriri? Ka o bu na o bughi ahu kariri uwe e yi n’ahu? Leenu umu nnunu na-efe n’elu. Ha
anaghi ako ugbo; ha anaghi ewe ihe ubi; nke ha na-ekpoko ihe n’oba. Ma Nna unu bi n’igwe na-azu ha.
O putara na unu adaghi oke onu ahia karia umu nnunu? Onye n’ime unu puru itukwasi ihe n’ogologo
ndu ya site n’ichegbu onwe ya? “Gini mere unu ji echegbu onwe unu banyere uwe unu ga-eyi n’ahu?
Leenu okooko osisi di n’ohia. Ha adighi aru oru; nke ha na-ekwe akwa. Ma asi M unu: O burugodu
mgbe Solomon yinyechara ihe dum o jiri buru eze, a choghi ya mma achoro otu n’ime umu okooko osisi
ndi a. “Unu bu ndi obere okwukwe, o buru na Chineke si otu a choo ahihia di n’ohia mma; ahihia nke
na-eto taa, echi a tunye ya n’ite oku; o bu na O gaghi elekwa unu anya karia ka O si elekwa ahihia ndi
a? Ya mere, unu echegbula onwe unu, na-aju si: ‘Gini ka anyi ga-eri? Gini ka anyi ga-anu? Gini ka anyi
ga-eyi? O bu ndi ogommuo na-atukwasa obi n’ihe nile ndi a. Nna unu nke igwe maara na ihe ndi a di
unu mkpa. Ma burugodunu uzo choo alaeze nke Nna na ezi omumeYa. A ga-atukwasikwara unu ihe ndi
ozo nile. Ya mere, unu echeghula onwe unu maka echi. Echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ubochi taa
zuuru ubochi taa.”
Ozioma nke Oseburuwa.
Otito diri Gi, Kristi.
8TH SUNDAY IN ORDINARY TIME REFLECTION
Masters own the slaves and demand obedience and loyalty from them. They determine
how things are to be done in the life of their slaves. A good slave will always do his
master's bidding and will go to any length please him. Our relationships with people and
things have become like that of the master and the slave. However, we have grown to
manipulate and split our loyalty to more than one master. We tend to have political,
cultural, social, spiritual, economic, material and ubiquitous masters depending on our
need and ambition. "Nature has placed mankind under the governance of two sovereign
masters, pain and pleasure. It is for them alone to point out what we ought to do, as
well as to determine what we shall do. Jeremy Bentham. We complain that the Lord has
abandoned and forgotten us but we are the ones who abandoned Him and pledge our
loyalty to someone or something else. A true and faithful disciple will never be shaken
by the winds of distractions and he will never trade his master for something or
somebody else. We find among us 'small masters' we adore and respect irrespective of
their bad influences. "Good masters teach good doctrine, but that taught by evil masters
is wholly evil" - St. Basil. Who do you look up to in life and what is his or her influence
over you?
Happy Sunday!!
Produced by ICC Choir